Ndị Rom 15

Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.

Romans 15:6 (UKJV) That all of you may with one mind and one mouth glorify God, even the Father of our Lord Jesus Christ.

4Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.

5Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.

6Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.

7Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto.

8Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.