9Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
10Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs.
11Keleerenụ m Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke.
12Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.
13Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.