Ndị Rom 16

Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.

Romans 16:17 (UKJV) Now I plead to you, brethren, mark them which cause divisions and offences contrary to the doctrine which all of you have learned; and avoid them.

15Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.

16Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.

17Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.

18Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.

19Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.