20Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
21Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.
22Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị.
23Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu.
24Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen.