Ndị Rom 16

Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.

Romans 16:27 (UKJV) To God only wise, be glory through Jesus Christ for ever. Amen.

25Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị.

26Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe.

27Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.