Ndị Rom 2

Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.

Romans 2:1 (UKJV) Therefore you are inexcusable, O man, whosoever you are that judge: for wherein you judge another, you condemn yourself; for you that judge do the same things.

1Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.

2Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi.

3Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.