Ndị Rom 2

Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.

Romans 2:10 (UKJV) But glory, honour, and peace, to every man that works good, to the Jew first, and also to the Gentile:

8Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma.

9Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ.

10Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.

11Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.

12Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.