17Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke,
18ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu;
19ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị,
20ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu.
21Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?