3Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke?
4Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
5Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi.
6Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị.
7Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi.