11Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke.
12Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye.
13Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.
14Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.
15Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara.