Ndị Rom 3

Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.

Romans 3:22 (UKJV) Even the righteousness of God which is by faith of Jesus Christ unto all and upon all them that believe: for there is no difference:

20Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.

21Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya.

22Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.

23Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.

24Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.