8Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
9Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke.
10Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.
11Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a.
12Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela.