14Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa.
15Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ.
16Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị.
17Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst.
18Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume.