19Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke.
20Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa.
21Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.