1Ya mere, ebe e sitere nʼokwukwe mee ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume, udo dị ugbu a nʼetiti anyị na Chineke site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara nke anyị na-eguzo nʼime ya ugbu a. Anyị nọ nʼọṅụ nweekwa olileanya na a ga-eme ka anyị keta oke nʼebube Chineke.
3Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi.
4Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.
5Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.