Ndị Rom 6

Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.

Romans 6:10 (UKJV) For in that he died, he died unto sin once: but in that he lives, he lives unto God.

8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.

9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.

10Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.

11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

12Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.