Ndị Rom 6

Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.

Romans 6:14 (UKJV) For sin shall not have dominion over you: for all of you are not under the law, but under grace.

12Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.

13Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.

14Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.

15Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.

16Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.