Ndị Rom 6

Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.

Romans 6:18 (UKJV) Being then made free from sin, all of you became the servants of righteousness.

16Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?

17Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.

18Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.

19Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.

20Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.