21Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
22Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
23Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.