1Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba?
2E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?
3Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ.
4Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.
5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.