5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.
6Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
7Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.
8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.