13Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.
14Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.
15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.”
16Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
17Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.