Ndị Rom 8

Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.

Romans 8:2 (UKJV) For the law of the Spirit of life in Christ Jesus has made me free from the law of sin and death.

1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst.

2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.

3Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ.

4Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.