Ndị Rom 8

Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya,

Romans 8:20 (UKJV) For the creature was made subject to vanity, not willingly, but by reason of him who has subjected the same in hope,

18Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị.

19Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.

20Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya,

21na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke.

22Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.