Ndị Rom 8

Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị.

Romans 8:23 (UKJV) And not only they, but ourselves also, which have the first-fruits of the Spirit, even we ourselves groan within ourselves, waiting for the adoption, to know, the redemption of our body.

21na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke.

22Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa.

23Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị.

24Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka?

25Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.