27Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.
28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.
29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna.
30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.
31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?