Ndị Rom 8

Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa,

Romans 8:38 (UKJV) For I am persuaded, that neither death, nor life, nor angels, nor principalities, nor powers, nor things present, nor things to come,

36Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.”

37Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya.

38Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa,

39maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.