11Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,
12ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
13Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
14Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba!
15Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”