15Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
16Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.
17Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”
18Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
19Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”