Ndị Rom 9

ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.

Romans 9:31 (UKJV) But Israel, which followed after the law of righteousness, has not attained to the law of righteousness.

29Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”

30Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,

31ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.

32Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ.

33Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.