6Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel.
7Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
8Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.
9Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
10Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik.