Rut 1

Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ.

Ruth 1:5 (UKJV) And Mahlon and Chilion died also both of them; and the woman was left of her two sons and her husband.

3Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ.

4Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri.

5Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ.

6Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel.

7Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.