Rut 2

Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.

Ruth 2:3 (UKJV) And she went, and came, and gleaned in the field after the reapers: and her hap was to light on a part of the field belonging unto Boaz, who was of the kindred of Elimelech.

1Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.

2Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.”

3Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.

4Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”

5Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.