Rut 3

Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye.

Ruth 3:10 (UKJV) And he said, Blessed be you of the LORD, my daughter: for you have showed more kindness in the latter end than at the beginning, inasmuch as you followed not young men, whether poor or rich.

8Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.

9Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”

10Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye.

11Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.

12Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.