Taịtọs 1

Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.

Titus 1:11 (UKJV) Whose mouths must be stopped, who subvert whole houses, teaching things which they ought not, for filthy illegal gain's sake.

9Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu.

10Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta.

11Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.

12Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”

13Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.