4Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya.
5Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.
6Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha.
7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
8Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.