9Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”
10Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
11Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.”
12Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.