Zekaraya 1

Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:

Zechariah 1:7 (UKJV) Upon the four and twentieth day of the eleventh month, which is the month Sebat, in the second year of Darius, came the word of the LORD unto Zechariah, the son of Berechiah, the son of Iddo the prophet, saying,

5Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

6Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”

7Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:

8Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.

9Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.