Zekaraya 5

Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.

Zechariah 5:1 (UKJV) Then I turned, and lifted up mine eyes, and looked, and behold a flying roll.

1Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.

2Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m, “Ahụrụ m akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị. Ogologo ya dị mita iri, obosara ya dịkwa mita ise.”

3Ọ gwara m, “Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-apụ na-ejezu nʼala ahụ niile. Nʼihi na dịka e si detuo ya, nʼotu akụkụ ya, a ga-esi nʼala a chụpụ ndị na-ezu ohi. Dịka e si deekwa ya nʼakụkụ nke ọzọ ya, onye ọ bụla na-aṅụ iyi ụgha ka a ga-esitekwa nʼala ahụ chụpụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.