8Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.
9Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.
10Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?”
11Ọ gwara m, “Ha bu ya na-aga Babilọn ebe ha ga-ewuru ya ụlọ. Mgbe ha wuchara ụlọ ahụ, ha ga-adọba nkata ahụ nʼelu ihe ndọkwasị.”