2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
4Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.