38Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
39Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
40Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.