1 Ihe E Mere 14

Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.

1 Chronicles 14:11 (UKJV) So they came up to Baalperazim; and David stroke them there. Then David said, God has broken in upon mine enemies by mine hand like the breaking out of waters: therefore they called the name of that place Baalperazim.

9Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.

10Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”

11Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.

12Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.

13Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.