7Elishama, Beeliada na Elifelet.
8Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha.
9Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.
10Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”
11Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.