1 Ihe E Mere 15

“Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.

1 Chronicles 15:12 (UKJV) And said unto them, All of you are the chief of the fathers of the Levites: sanctify yourselves, both all of you and your brethren, that all of you may bring up the ark of the LORD God of Israel unto the place that I have prepared for it.

10Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. (112) Aminadab bụ onyeisi ha.

11Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,

12“Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.

13Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”

14Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.