1 Ihe E Mere 15

Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.

1 Chronicles 15:16 (UKJV) And David spoke to the chief of the Levites to appoint their brethren to be the singers with instruments of music, psalteries and harps and cymbals, sounding, by lifting up the voice with joy.

14Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.

15Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

16Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.

17Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,

18tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.