24Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
25Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
26Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.
27Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.
28Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.