22Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
23Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
24Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
25Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
26Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.