20Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị
21Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
22Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
23Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
24Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.