10Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
11Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
12Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.
13Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
14Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.